Psalms 89

Abụ maskil nke Etan, onye Ezra.

Ọgbụgba ndụ Chineke na Devid

1Aga m abụ abụ banyere oke ịhụnanya Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi;
aga m eji ọnụ m mee ka ọgbọ niile mara
maka ikwesi ntụkwasị obi gị.
2Aga m ekwupụta na ịhụnanya gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;
na i mere ka ikwesi ntụkwasị obi gị, guzosie ike nʼeluigwe.
3Onyenwe anyị sịrị, “Mụ na onye m họpụtara agbaala ndụ.
Aṅụọkwala m iyi nye ohu m Devid sị,
4‘Aga m eme ka agbụrụ gị guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi
meekwa ka ocheeze gị dịgide ruo ọgbọ niile.’ ” Sela

5O Onyenwe anyị, eluigwe na-eto ọrụ ebube gị niile,
na ikwesi ntụkwasị obi gị, nʼetiti nzukọ ndị dị nsọ.
6Nʼihi, ọ bụ onye nʼeluigwe niile, ka a ga-eji tụnyere Onyenwe anyị?
Onye yiri Onyenwe anyị nʼetiti ndị mmụọ ozi niile?
7Na nzukọ ndị nsọ, Chineke bụ onye a na-atụ oke egwu;
ọ dị oke egwu karịa ndị niile gbara ya gburugburu.
8O Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, onye dịka gị?
Gị, O Onyenwe anyị, dị ike nke ukwuu, ikwesi ntụkwasị obi gị na-agba gị gburugburu.

9Ị na-achị osimiri nke ji ike na-asọ;
mgbe ebili mmiri ya na-amali elu; i na-eme ka ha dajụọ.
10Ị zọpịara Rehab dịka otu nʼime ndị ahụ e gburu egbu;
jiri aka gị dị ike chụsasịa ndị iro gị.
11Ọ bụ gị nwe eluigwe; gị nwekwa ụwa,
ọ bụ gị tọrọ ntọala elu ụwa dum, na ihe niile dị nʼime ya.
12Ọ bụ gị kere ugwu na ndịda;
Taboa na Hemon na-abụ abụ ọṅụ nʼihi aha gị.
13Aka gị ka e mejupụtara nʼike;
aka gị dị ike, a na-ebuli aka nri gị elu.

14Ezi omume na ikpe ziri ezi, bụ ntọala ocheeze gị;
ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi, na-aga nʼihu gị.
15Ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ ndị na-eji olu iti mkpu ọṅụ na-abụku gị abụ,
ndị na-ejegharịkwa nʼìhè nke ihu gị, O Onyenwe anyị.
16Ha na-aṅụrị ọṅụ nʼaha gị ogologo ụbọchị niile;
ha na-aṅụrị nʼezi omume gị.
17Nʼihi na ị bụ ebube na ike ha,
site nʼihuọma gị, ị na-ebuli mpi anyị elu.
18Nʼezie, ọta anyị bụ nke Onyenwe anyị,
eze anyị bụkwa nke Onye nsọ Izrel.

19I kwuru okwu otu mgbe site nʼọhụ,
nye ndị gị kwesiri ntụkwasị obi sị:
“Enyela m otu onye dị ike agha ike;
Ebuliela m otu nwa okorobịa elu site nʼetiti ndị m.
20Achọtala m Devid ohu m,
were mmanụ nsọ m tee ya.
21Aka m ga-agba ya ume;
nʼezie, aka m ga-eme ka ọ dị ike.
22Ọ dịghị onye iro ga-abịakwasị ya, na mberede;
ọ dịghị onye ajọ omume ga-emegbu ya.
23Aga m etigbu ndị iro ya niile nʼihu ya.
Aga m emekwa ka ndị niile na-akpọ ya asị laa nʼiyi.
24Ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi ga-adịnyere ya,
site nʼaha m, a ga-ebuli mpi ya elu.
25M ga-edo aka ya nʼoke osimiri,
Ọ ga-achị oke osimiri na osimiri niile

dokwaa aka nri ya nʼosimiri niile.
Oke osimiri na osimiri niile a na-ekwu banyere ha nʼebe a, bụ osimiri Mediterenịa na Yufretis, na osimiri ndị ọzọ niile na-asọbanye nʼime ha. Oke ala ochie ahụ e kwere Devid na Solomọn na nkwa jedebere nʼosimiri ndị a.

26Ọ ga-akpọ m sị m, ‘Ị bụ Nna m,
bụrụkwa Chineke m, na oke Nkume nzọpụta m.’
27Aga m eme ya nwa mbụ m,
onye kachasị dị elu nʼebe eze niile nke ụwa nọ.
28Aga m eme ka ịhụnanya m nwere nʼebe ọ nọ dịgide ruo ebighị ebi,
ọgbụgba ndụ mụ na ya ga-adịgidekwa.
29Aga m eme ka agbụrụ ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi,
ocheeze ya ga-adịgidekwa dịka eluigwe na-adịgide.

30“Ọ bụrụ na ụmụ ya elefuo iwu m niile anya,
gharakwa ijegharị nʼụzọ m niile,
31ọ bụrụ na ha elelịa ụkpụrụ m niile anya,
hapụkwa idebe ihe m nyere ha nʼiwu,
32aga m eji mkpọrọ taa ha ahụhụ maka mmehie ha,
tikwaa ha ụtarị maka njehie ha;
33ma agaghị m ewezuga ịhụnanya m, nʼebe ha nọ.
Ma ọ bụ laa azụ nʼikwesị ntụkwasị obi m.
34Agaghị m emerụ ọgbụgba ndụ m.
Agakwaghị m agbanwe ihe ọbụla siterela nʼọnụ m pụta.
35Ejirila m ịdị nsọ m ṅụọ iyi, kpebie
na m apụghị ịghara Devid ụgha,
36na agbụrụ ya ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
ocheeze ya ga-adịgidekwa nʼihu m ka anyanwụ na-adịgide.
37Ọ ga-adịgide ruo ebighị ebi dịka ọnwa.
E, dịka ọnwa ahụ, onye akaebe m kwesiri ntụkwasị obi na mbara eluigwe.” Sela

38Ma ị jụla, i werela nlelị jụkwa,
i na-ewe iwe dị ukwu megide onye gị e tere mmanụ.
39Ị jụla ọgbụgba ndụ gị na ohu gị gbara
i merụọla okpueze ya nʼime ntụ dị nʼala.
40Ị kụtuola mgbidi gbara ya gburugburu,
i meela ka ebe ya niile e wusiri ike bụrụ ihe dapịara adapịa.
41Ndị niile si ụzọ ahụ na-agafe, ezuruchaala ihe niile o nwere.
Ndị agbataobi ya na-akwakwa ya emo.
42I meela ka aka nri ndị iro ya dị elu;
mekwaa ka ndị iro ya ṅụrịa ọṅụ.
43I meela ka aka o ji jide mma agha ya sụọ ngọngọ,
i nyereghị ya aka mgbe agha dara.
44I meela ka ịma mma ya gwụsịa.
Ị tụdakwala ocheeze ya nʼala.
45I meela ka ụbọchị ndụ nke okorobịa ya dị mkpụmkpụ.
I ji ihere dịka akwa kpuchie ya.

46Ruo ole mgbe Onyenwe anyị, ka ị ga-ezonarị onwe gị?
Ruo ole mgbe ka iwe gị dị ukwuu ga-eregide dịka ọkụ?
47Cheta, na ndụ m bụ ihe na-agafe ngwangwa.
Nʼihi ihe efu gịnị ka i ji kee mmadụ niile!
48Olee onye ahụ nwere ike ịdị ndụ ghara ịhụ ọnwụ anya,
maọbụ zọpụta onwe ya site nʼike nke ili
Ya bụ, ala mmụọ
? Sela
49O Onyenwe anyị, olee ebe oke ịhụnanya mbụ dị,
nke i sitere nʼikwesị ntụkwasị obi gị ṅụọrọ Devid nʼiyi?
50Onyenwe m, cheta otu e si leda ndị ohu gị anya,
otu m si anagide nʼime obi m ịchị ọchị niile nke ndị mba niile.
51O Onyenwe anyị, ịchị ọchị nke ndị iro gị ji akwa m emo,
nke ha ji lelịa nzọ ụkwụ niile nke onye gị i tere mmanụ.


52Otuto dịrị Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi.
Amen na Amen.
Copyright information for IboBIU